Thursday 18 June 2020

IWE DỊ M N'OBI ( by Silas Nwenya)


*IWE DỊ M N'OBI!*

Iwe ejula m obi
Anya mmiri m na-ada ka akụmmiriigwe
Ọ dịzị m ka ọ bụ arụ icheta ihe gara-aga

Mana onye chefue ihe gara-aga, ihe na-eme ugbu a erie ya ka mmiri
Onye chefue ihe gara-aga, ihe ndi na-abịa abịa ewere ya mere ihe ọchị

Ncheta m na-echeta ihe ndiọcha mere anyị na mbụ ma tinyekwara nke ha ka na eme anyị ugbu a na-acha m ọkụ n'obi

Mgbe mbụ mụ hụrụ onyeọcha, ọ dị m ka m ahụla Chineke
Mgbe ahụ, ọ kpụọ m naanị otu mkpọ oku m azaa ya ugboro asaa

Mụ kwụrụ na-ele ka ntụtụ dị ya n'isi si agba egwu ma ikuku na-eku, ebe nke m kwụrụ chịm ka chi si kee ya; ọ dị m ka m bụrụ onye ọcha

Mgbe ahụ mpịọmpịọ imi ya dịka ike ègbè na-agụ m agụụ imetụ aka

Ebe m na-emepe ọnụ ekwu okwu ka ụwa mara ihe dị m n'obi, ọ na-esi n'imi eme hụhụhụ n'ihi na ọ chọghị ka a mara uche ya

Mgbe ahụ, e chere m na onyeọcha na ihe ya niile bụ sọ mma
Nke a mere ka m kpụọ ihe njirimara ndiojii niile asị
Ma kwere na nke onyeọcha niile bụ e kwuchaa agwụ

Na mbụ, akwụkwọ ahụ onyeọcha ji n'aka ma na-agụpụtakwa ihe dị ya n'ime na-adị m ka ọ bụ ya na ụmụagbara na-akparịta ụbụbọ

Na mbụ, ịhapụ ụlọ mkpuke m bi n'ime ya, soro onyeọcha larie kpamkpam na-agụ m ka agụụ mmiri

Mgbe ahụ, naani isoro onyeọcha rie ihe, soro ya gbaa ụgbọala, anyịnyaigwe nakwa isoro ya felie elu ka nnụnnụ  ka m na-amụrụ anya abalị

Ma ugbu a, a bịala m were anya hụta na ihe niile na-amụkesi amụke abụghị ọlaọcha nke ha ji abụ ọlaedo
Ahụtala m na ọtụtụ ihe ndi a bụ ọchakaọmaka

Ugbu a nwata eriela ihe ọ na-amụrụ anya, ụra ejidela ya 
Ogori alụọla di nabọ mara nke ka mma 
E buola m mmiri buo mmanya were mara nke ka ịnyị arọ

E sorola m onyeọcha rute ala nna ya, soro ya gụọ akwụkwọ ya ahụ, soro ya rie ihe oriri ya ma ñụọ ihe ọñụñụ ya
A hụtala m na ọ bụghị ka akụilu si ada na ntị bụ ka o si atọ n'ọnụ

Iwe na ọnụma ejula m obi n'ihi na onyeọcha m kpọrọ mmadụ na-akpasozị m ajọ agwa karịa nke ọ na-akpaso anụmanụ

A gụpụtala m n'ime akwụkwọ ya ahụ ka o si were ube-ụtarị, mma na egbe chịrị ụmụnnem ka ehi laa ma gbaa ha ohu

N'me otu akwụkwọ ya ahụ ka m gụpụtara ka o si kpọrọ nwanne m nwanyị, metọsịa ya ma gbaa ya ọtọ n'ihu igwe mmadụ dịka onye ohi

Iwe juru m obi mgbe m gụpụtara n'ime akwụkwọ ya ahụ ka nna m ha siri were isi na-ebu onyeọcha ka onye dara ọrịa

Ugbu a ka m matara na echiche onyeọcha na-echere m dịka nke nwamba na-echere oke

Ugbu a ka m bụ onye erimeri riri ma rigbuo onwe m
Site na ịhapụ nri ala Afrika na mmanya ndi Afrika ma bagide nke onyeọcha, ọrịa suga, ọnyaafọ na kansa na-azọzị nke ga-ebuụzọ were m

Ugbu a, na ala Afrika adịghị mma bụ akaọrụ onyeọcha

Umu Afrika, kunitenu ma chee echiche maka ala unu
Jikọọ nụ aka ọnụ ma were nke unu mere nke unu

E sorola m nwanne m nwoke Hakọt Waitị welie onu elu ma tie mkpu sị
Lọtanụ! Ka anyị were ehihe chọba ewu ojii anyị tupu abalị abaịakwudo anyị

Lọtanụ! N'ihi na osisi ahụ bụ ya mịa mkpụrụ mmadụ anwụọ na-esozịkwa ifuru

Lọtanụ, n'ihi na onye nwe oba kpụọ ọba ya mkpọkọrọ, agbataobi ewere ya kpuo ntụ

Lọta nụ n'ihi na agha ahụ akara aka na-achọzịkwa iri nwangwụrọ

Lọta nụ ka anyị kwụsị iji aka anyị jekwuru onyeọcha na-gwa ya  biko 'gbaanụ m ohu ka isi gbaa ndi nna nna anyị ha

Lọta nụ biko lọta nụ

 Iwe ejula m obi!

Sai Nwenya

No comments:

Post a Comment