Tuesday 23 June 2020

AHA M BỤ NAIJIRIA By Sai Nwenya

 AHA M BỤ NAIJIRIA











A bụ m agbara nwaanyị.
Nnukwu nwaanyị mara nnukwu mma ka m bụ
E topuru m etopu
I lee m anya n'obi, ị ga-ahụta na obi m sara mbara
Obinigwe kechara m nye m nnukwu ogbe araa abụọ maka iji zụọ ọtụtụ ụmụaka ọ chọrọ ka m mụọ
Araa m ndi a na-agbapụta mmiri araa dị nnukwk ụtọ kwamgbe kwamgbe

Ụmụaka m na-añụrịkwa mgbe ha na-amịrị mmiri araa m ndi a dịka nwa-ehi si amị nke nne ya
Ụwa kpọrọ araa m ndi a Naija na Benuwee
Chukwu Okike Abịama kechara m sụnye m ìkè n'ime oke osimiri Atlantiki

Ebe ahụ ka m gbanyere mgbọrọgwụ
Nke a mere m ji amị mkpụrụ ma n'udummiri ma n'ọkọchị

Site n'isi m rue n'ụkwụ m bụ naanị akụnụba juputara ya
Ka m na-asụpụta mmiri bụ ka m na-asụpụtakwa mmanụ, ọlaọcha, ọlaedo, ọlaigwe, unyi kol nakwa okwute ndiọzọ dara oke ọnụ ahịa

A mara m ama na mba ụwa niile dịka ezenwaanyị, akajiakụ, ọnyịrịmmagba, ọkaibe nakwa aha ndiọzọ na-ada ụda
A dị m afọ iri isii mana a ka m na-atụkwa ime na-amụ ụmụ
Mgbe ọbụla m guzoro ọtọ, ihe eji amata m bụ na akụkụ m nke a na-acha akwụkwọ-ndụ akwụkwọ-ndụ; akụkụ m nke ọzọ na-enwu ọcha dịka akụmmiriigwe

Ihe nke a pụtara bụ na abụ m onye udo ma dịkwa uchu n'ọrụ ugbo
Ka Chi m si hụ m n'anya, mmiri na-ezoro m mgbe o kwesiri izo

Anwụ na-achakwara m mgbe o kwesiri ịcha
Eke kere ụwa kere m ma chọọ m mma
Na-agbanyeghị na m dị afọ iri isii
A ka m dịka nwaagbọghọ dị afọ iri na asatọ na-amaghị nwoke ọbụla
Mma m na-eto ụmụnwoke akpịrị nke ukwuu
Ewoo! Chukwu kere m, ekele dịrị gị

N'ime iheọma niile ndi a Chukwu jiri chọọ m mma, a nọkwa m n'ime iru uju
Anyammiri ejula m anya
E begbuela m onwe m n'akwa
Enweghịkwa m onye na-agụgụ m
Ndi na-eme m ibe akwa gbara m gburugburu

Mụ na Rachel na-amazị aka onye ka ibe akwa n'ihi ihe ndi mmadụ na-eme m

Ndintọ atọrịkpụọla ụmụ m
Ndinchịehi na-asụkwa ụmụ m akwụ ma kwụwa ha agụụ
Ndi-ọlụọ-ọlaa nke akpọrọ banditi na-egbukwa ụmụ m ka a na-egbu ọkụkọ

Ọ bụghị sọ ihe ndi a ka m na-ebere akwa
Ndi ụfọ-nfọjuakpa na-ebufe akụnụba m obodo ndiọcha ka a ga-asị na ha amaghị na ndiọcha emeela m echeta ebewe na mbụ

Ọbara na-agbapụtazịkwa m n'anya n'ihi na anyammiri agwụla m n'anya
Anyaukwu ụfọdụ ụmụ m na-egbuzịkwa ụmụ m ndiọzọ
N'ihu m ka naanị otu onye na-ebu ihe dịịrị ọha rie ma kpọọ onwe ye Ọkaaomee
A dịzị m ka nnekwu-ọkụkọ nke mụrụ ọtụtụ ụmụ
A mazịghị m nke bụ dịọkpara m na nke bụ isi ada m

Ndi mba ọzọ na-abatazị m n'ime n'ikem n'ikem 
Ha na-abịa ñụrụ araa m ma bukọrọkwa akụnụba m gbalaga
Ebe agụụ jizi iwe na ọnụma apịa ụmụ m ịtarị n'ihu m
A dịzị m ka akịdị
A mazịghị m ebe oke ala m dị
Amazịghị m ụmụ m na ndi ọbịaa m ndi nke kazị ibe ha

Aha m bụkwa ekwenchịta!
Ndi-nkịtị agbalịala ịchị m n'ụdị nke ha kpọrọ palịamenti mana ihe enweghị isi
Ndiagha anwaala ike ha site n'ụda egbe ma ije ekweghị ojije
Ndi nkịtị nke onye kwue uche ya ahapụla onye kwue uche ya banye na nke onye mee uche ya

Ebe iwu eji achị m nwere ike bụ naanị n'ahụ ndi opekatampe
Iwu ndi a enwezịghị ike kọpọ maọbụ nke afụ n'ahụ ndi okeozu na nke ndi ọchịchị
Kedu ihe ga-egbochi m iru uju?
Kedu ihe ga-anapụ m ibe akwa?
Ọnụahịa mmanụ m akpụọla n'ala na mba ụwa

Ego m dịzị ka mpekere akwụkwọ nkịtị n'ebe ndi ogbo ya ndi ọzọ nọ
Ụmụaka m ewerela akaazụ na iri ngarị rigbue onwe ha ma rigbuokwa mụonwe m
Ụmụ m ndi ụbụrụ ha na-acha ọkụ jizi ọsọ agbapụ n'ime m were agbaga mba ọzọ ebe eji ha eme ihe ọchị
Na mbụ, ị kpọọ m aha na mba ofesi isi m eguzoro kwem 

Mana ugbu a, ị kpọọ m aha n'obodo ndi ọzọ ihu agbarụọ m maka na ha na-ekpuchi aka n'imi ka m na-esi isi
Onye ga-etikwanụ m aka n'obi? 
Biko zaa nụ m!
Aha m bụ Naijiria!!
Nnukwu obodo nke Afrika!!!

Sai Nwenya

No comments:

Post a Comment